Take a fresh look at your lifestyle.

Popu ‘kwụsiri ike’ mgbe o nwechara nsogbu iku ume n’ụlọọgwụ – Vatican

0 335

Onyeisi ụka Katọliki na mba ụwa niile bụ Popu Francis malitere inwe ọrịa oyi ka mgbe izuụka abụọ garaaga, kwụsiri ike dịka o nwechara nsogbu iku ume n’ụbọchị Fraịde abali iri abuo na asato nke onwa Febụwarị 2025.

Popu dị afọ iri asatọ na asatọ malitere ịgbọ agbọọ nke mere ka nsogbu iku ume o nwere kawanye njọ n’ụlọọgwọ n’abalị ahụ mana eji ihe mkpuchi ihu iji nyere ya aka iku ume.

Mana Vatican kwuru na mgbede ụbọchị Satọde na Popu enwebeghị nsogbu iku ume ọbụla ọzọ dịka ọ na-anabata ọgwụgwọ oxygen nke ọma.

Ha kwupụtaghị ihe kpatara ọrịa ahụ, mana ha kwuru na Popu mụ anya ma nọgide nke ọma.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *