Take a fresh look at your lifestyle.

Katsina steeti azutala ntu fatilaiza maka inyere ndi ọrụ ubi aka

0 445

Gọọmenti Katsina steeti kwuru na ha ejirila ihe karịrị ijeri naira iri atọ na isii wee zụta fatịlaịza puku metric tonne iri abụọ n’oge ọrụ ugbo 2024, tinyere ọrụ ugbo ndị ọzọ.

Ọ gbakwụnyere na ọ nyekwara moto ọgba tum tum 722 na ihe nfesa knapsack maka iji ndị ọrụ ndọtị narị asaa na iri abụọ na abụọ, e zigara ije ozi na ngalaba 361 n’ofe steeti ahụ, iji hụ na nleba anya nke ọma.

Osote Gọvanọ, Alhaji Faruq Lawal-Jobe, kwupụtara nke a n’oge ọgbakọ akụkọ steeti na-enwe kwa ọnwa na Sọnde na Katsina.

Dị ka ya si kwuo, e nyekwara ihe karịrị ijeri naira iri abuo na out na uma asaa maka ịzụ traktọ narị anọ nwere ngwa zuru oke, ndị na-akụ ihe ọkụkụ puku abuo na igwe mkpokọta iri.

“Nke a bụ iji nye ndị ọrụ ugbo anyị ngwa ọrụ ugbo chọrọ, iji kwalite mmepụta nri na steeti ahụ.

“Na mgbakwunye, etinyela ihe karịrị nde naira 790.5 maka nkwalite ụlọ ahịa zonal asaa dị na Funtua, Daura, Katsina, Mani, Kankia, Kafinsoli na Malumfashi.

“Anyị ga-eme ka ụlọ ọrụ Songhai Farm Center dị na Makera dị na Dutsin-Ma Local Government, yana Cotton Value Chain, maka ọrụ ugbo na-arụ n’afọ niile, iji nye ndị mmadụ ọrụ na ike akụ na ụba,” ka o kwuru.

Lawal-Jobe gara n’ihu kọwa na ụlọ ọrụ ahụ ekesakwara fatịlaịza mmiri mmiri ewepụtara ọhụrụ iji mee ka mkpụrụ dị mma.

Ọ gbakwụnyere na gọọmentị hụkwara na arụchaala ọrụ Sustainable Platform for Agriculture (KASPA) steeti dị n’isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọrụ ugbo.

“Ndị na-ahụ maka ọrụ ugbo na ime obodo (KTARDA) emeela ọtụtụ ọrụ maka imeziwanye ọrụ ugbo na steeti ahụ.

“Gọọmentị ejirila ego dị nde naira 273.6 rụọ ọtụtụ ọrụ maka mmepe ọrụ ugbo.

“Ndị a gụnyere ịzụrụ na nkesa ọgba tum tum iri ano maka ọrụ nlekota oru.

Na mgbakwunye, e kesara ndị ọrụ ugbo kemịkalụ agro maka igbochi ụmụ ahụhụ,” ka o kwuru.

Iji were ọrụ nke ndị ọrụ ndọtị dị narị asaa na iri abụọ na abụọ a kpọtụrụ aha na mbụ, Lawal-Jobe kwuru na e kesara ndị ọrụ ugbo n’ofe steeti ahụ osisi moringa dị puku iri ise na anọ na otu na iri ise.

Dị ka ya si kwuo, ngụkọta ụmụ nwanyị otu nari na iri ise ka a zụrụ azụ ma nyekwa ha ike n’ịkọ ugbo n’azụ ụlọ na nhazi nke mgbakwunye nri na-edozi ahụ.

“Ọzọkwa, KTARDA emeela mmemme data nke ndị ọrụ ugbo n’ofe steeti ahụ iji chọpụta ọnụọgụ ndị ọrụ ugbo na data metụtara ya, ụdọ uru ihe ọkụkụ, nha na ebe ọ nọ.

“Ọrụ a na-eje ozi dị ka ntuziaka iji chọpụta izi ezi na njikwa data na ime ka ọ dị mfe ịnweta ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ugbo maka enyemaka kwesịrị ekwesị. “Ụlọ ọrụ ahụ esonyekwara na ihe ngosi ọrụ ugbo nke mba na nke steeti, iji gosipụta oke ọrụ ugbo nke steeti,” osote gọvanọ kwuru.

Dị ka ya si kwuo, n’ịgba mbọ hụ na a na-enweta ngwa ahịa na ngwa ọrụ ugbo zuru oke iji kwalite mkpụrụ nke ndị ọrụ ugbo n’ofe steeti ahụ, ego ruru nde naira 386.1 n’okpuru ụlọ ọrụ Farmers Supply Company Ltd (FASCOKT).

Lawal-Jobe kwuru na ụlọ ọrụ ahụ arụzigharịrị ụlọ nkwakọba ihe maka nchekwa mkpụrụ, kemikal na ngwa ọrụ ugbo dị na Funtua na Daura, na mgbakwunye na ịrụzi otu ebe ọrụ.

Ọ gbakwụnyere na a zụrụkwa kemịkalụ agrochemical dị iche iche na mkpụrụ osisi ndị emepụtara nke ọma wee kesaa ndị ọrụ ugbo, na-agbakwụnye na ọchịchị ha ewepụtala akụrụngwa zuru oke, iji kwalite ọrụ nchekwa anụ ụlọ na ịta nri.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *