Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Kano steeti bụ Abba Kabir Yusuf eweghachitela Muhammadu Sanusi II dịka Emir nke Kano.

Chigo deziri ya n'Igbo.

0 224

Cheta na n’afọ 2020 n’oge ọchịchị Umar Ganduje dịka Gọvanọ, Odeakwụkwụọ ụkwu steeti ahụ bụ Alhaji Usman Alhaji mara ọnwa nchutu n’ọkwa nke Muhammadu Sanusi dịka Emir nke Kano.

Gọọmentị steeti agara n’ihu wewapụta alaeze anọ ọhụrụ merere ya alaeze ise( 5 emirates) na Kano Steeti.

Gọvanọ Kano steeti bụ Abba Kabir Yusuf eweghachitela Muhammadu Sanusi II dịka Emir nke Kano.

Gọvanọ ahụ kwuru nke a ka o binyechara aka n’iwu megharịrị iwu nke hibere iwu ọchịchị obodo Kano nke afọ 2019.

Ndị omeiwu Kano steeti nọrọ taa mee mkpebi maa kagbuo alaeze ise nke Kano – bụ Kano, Bichi, Rano, Karaye na Gaya.

E nyefere iwu ahụ n’aka gọvanọ onye mechara binye aka na ya.

N’okwu ya, Gọvanọ Kabir kwuru: “Mgbe a kagbuchara akwụkwọ iwu ọchịchị obodo Kano nke afọ 2019, nke a pụtara na alaeze nke Kano laghachiri n’ọnọdụ ya tupu iwu afọ 2019″.

Ọ gara n’ihu kwuo na “Ọ bụ naanị Muhammadu Sanusi II bụ Eze enwere na Kano steeti”.

Leave A Reply

Your email address will not be published.