Take a fresh look at your lifestyle.

Public Ranch Agency Bill: Iwu a a ga-egbo ọgụ ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo?

0 640

Iji kwọọ onye ukwu wara n’ọgụ a na-adakarị n’etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo, ụlọ omeiwu nke Enugwu steeti abịanyela aka n’akwụkwọ wepụta iwu a kpọrọ: Public Ranch Agency Bill.

Ụbọchị tuzde 7th May ka ndị kachw nnukwu n’ọnụ ọgụ binyere aka n’akwụkwọ iwu ahụ n’ụlọ Enugwu steeti “House of Assembly” .

Ihe nkea pụtara bụ na ndị ochụ ehi agaghịzị na agaghari, kama ha na ehi ha ga-anọrọzia n’ime Ranch ma-ata nrị.

KEDU NKỌWA YA BỤ BILL

Aha bill ahụ bụ PUBLIC RANCH AGENCY BILL, nkea bụ iji kwụsị ọgụ na esemokwu n’etiti ndị ọchụ ehi na ndị obodo n’ebe di iche uche n’Enugwu.

Otu ahụ ga na elekọta Ranch nke ndị nkịtị nakwa nke adị n’ọha nwere.

Mazi Harrison Ogara bụ onye n’anọchite anya Igboeze South n’ụlọ ome iwu gwara ndi ntaakuo na Bill ahụ ga enyere aka ka ndị ọchụ ehi ahụ na-akpakarị ike ọjọọ nọdụ n’ime ọhịa Ranch ha, ghara iji ehi ha atachasị ihe akọrọ n’ugbo.

Ogara kwukwara na otu ọhụrụ ahụ ga ehi aka n’anya hụ na usoro ha ga-eji nweta ala ma ọ bụ nye ndị ọchụ ehi ọnọdụ n’obodo ọbụla abụghị nke ga ebute nsogbu ọzọ.

GINI KA NDỊ OMEIWU ENUGWU STEETI KWURU MAKA YA BỤ BILL TUPU HA BIANYE AKA N’AKWỤKWỌ

Onye na-anọchite anya Igboeze North bụ Mazi Clifford Obe kwuru na iwu iguzobe Public Ranching ga-akwụsị ọgụ na etiti ndị ọchụ ehi na ndị ọrụ ugbo yanakwazi ogbugbu ndị ọchụ ehi na egbukarị ndị obodo na mpaghara di iche iche n’Enugwu.

Mazi Okechukwu Okeke na anọchite anya Udi south constituency yọrọ ka ndị mmadụ ghara ị na-atụ egwu maka bill ahụ n’ihi na ọbụghị nanị ndị Ugwu na-achị ehi, okwuru na ụfọdụ ndị banyị abanyela na ya bụ ọrụ nke mere na iwu Ranching ga-enyere ha aka ịnọdụ otu ebe.

Iji kpokọọ okwu niile, ọnụ na ekwuru ụlọ nzukọ Steeti nke Enugwu bụ Uche Ugwu gwara ndị Enugwu ka obi dajụọọ ha n’ihi na ya na ndị ome iwu ibe ya agaghị abịanye aka n’iwu ọbụla ga emeru ha ahụ kama na ọ bụ ọdị mma ha, ka ha na-agba mbọ ya kwa ụbọchị.

GỌMENTI ENUGWU AMACHIBUOLA “OPEN GRAZING” NAKWA ỊCHỊGHARỊ EHI N’ABALI.

N’oge gara aga, gọmenti Enugwu nakwa nke mpaghara ọwụwa anyanwụ ndị ọzọ machiri ndị Ugwu ịchị ehi ha na-agagharị ma ọ bụ ịchịgharị ha n’abalị ka ha taa nri.

Ugbua Gọmenti Enugwu n’ekwkwaazi na ọ bụ ịwu kpọm kwem na ndị ọchụ ehị ahụ nọrọzịa otu ebe ghara ịchị ehi na-agagharị mere ha jiri wega ya bụ iwu na ụlọ ome iwu Enugwu.

Cheta na kwa mgbe kwa mgbe ka akụkọ na ndị ọchi ehi wakporo ndị obodo gbuo ọtụtụ mmadụ na apụtakari n’Enugwu steeti.

Ụdị ihe ịgba anya mmiri a na-apụtakarị n’okpuru ọchịchị Uzo-Uwani, Igboeze north, Udi Awgu nakwa ebe ndị ọzọ.

Omebeghi izu ụka atọ ndị omekome echere na ha bụ ndị ọchi ehi gburu ụmụ nne abụọ ebe ha gara ugbo na Ugwujoro di na Nimbo, Uzo-Uwani Enugwu steeti.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.