Take a fresh look at your lifestyle.

Onye isi ala Tinubu eduola na iyi ọrụ ndị kọmishọna abụọ ọzọ maka NPC

0 150

Onye isi ala Bola Ahmed Tinubu aṅụọla ndị kọmishọna Federal abụọ ọzọ nke National Population Commission (NPC), na Council Chamber nke President Villa, Abuja.

Ndị kọmishọna e chiri iyi ọhụrụ bụ Fasuwa Johnson (Ogun State) na Amidu Raheem, (Osun State).

Nkwenye ha bịara izu ole na ole ka ndị ọrụ ibe iri na asaa ṅụchara iyi ọrụ na March.

Ka ọ dị ugbu a, Federal Executive Council (FEC), tupu ha abanye n’ọnụ ụzọ mechiri emechi, gbachiri nkịtị otu nkeji iji sọpụrụ onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ Fabian Osuji na onye bụbu minista Sayensị na teknụzụ, Ogbonnaya Onu.

Fabian Osuji, bụ onye nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri asatọ na abụọ na February, jere ozi dị ka onye minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ n’oge ọchịchị onye isi ala Olusegun Obasanjo bụ ebe ọ rụrụ ọrụ dị mkpa n’ịmalite atumatu ndị na-emetụta nke ọma na ngalaba ahụ.

Dr.Ogbonnaya Onu, nwụrụ mgbe ọgbara afọ iri asaa na abuo.

A họpụtara ya Minista Sayensị na Nkà na ụzụ n’oge ọchịchị onye isi ala Muhammadu Buhari.

Leave A Reply

Your email address will not be published.