Take a fresh look at your lifestyle.

NNPCL ga-amaliteghachi ego obodo a:MELE KYARI.

Chigo deziri ya n'Igbo.

0 301

 

Mele Kyari, onyeisi nke Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL),  agbaala mbọ na ịbawanye gaasi nke   obodo  a na nke mba ụwa n’ebumnobi nke ịmaliteghachi ego mba a.

Kyari kwuru na site n’ịkwalite mmepụta gaasi, NNPCL ga-ekere òkè ya n’ịkwado naira.

Nwamadi a  nke  NNPCL gwara ndị nta akụkọ ka ọ gara leta onyeisi ala Bola Ahmed Tinubu n’ụlọ , ebe ọ na-eme mmemme Eid Al-Fitr.

“Ọ bụkwa ohere zuru oke iji mesie onyeisiala obi ike na ya na-elekwasị anya na ịnyefe gas n’ahịa anyị, ma n’ime ụlọ na nke mba ụwa, na iweghachite ọganihu na mba a ,” ka o kwuru.

Kyari kwuru na NNPCL ga-eji ọnụ ahịa ngwa ahịa ya n’ahịa zuru ụwa ọnụ iji mee ka ọnụ ahịa naira sikwuo ike.

Leave A Reply

Your email address will not be published.