Take a fresh look at your lifestyle.

Maka nwoke a sị tigburu nwunye ya n’Enugwu Steeti

0 224

Akụkọ fesara ebe niile taa na otu nwaokorobịa tigburu nwunye ya n’Enugwu Steeti.

Nwaokorobịa ahụ bụ Daniel Nnabuife gbara afọ 25 bụ onye e kwuru ji aka tigbuo nwunye ya mụrụ nwa ọhụrụ n’Enugwu Steeti.

Ngwa ngwa, ndi ntaa akuko zọpụrụ njem gaa n’obodo Ugboye dị n’Abakpa Nike ebe asị akụkọ ahụ mere ịchọpụta nke bụ eziokwu.

Onye ntaakụkọ anyị hụrụ nwoke ahụ a na-ebọ ebubo na o gburu nwunye ya bụ Blessing Nnabuife gbara afọ 22 ebe ọ na-ebe nnukwu akwa sị na otu mkpụrụ akwụ ya tinyere n’ọkụ efuola.

Mazị Nnabụife, onye Orlu dị n’Imo Steeti gwara ndi ntaa akuko na ọ bụghị eziokwu na ya tigburu nwunye ya, kama na ọ bụ ọrịa gburu ya n’isi ụtụtụ taa.

Dịka ọ kọwara, nwunye ya bụ onye Ebonyị steeti mụrụ nwa ọhụrụ otu ọnwa gara aga mana kemgbe ọ mụchara nwa, ahụ ya niile na ụkwụ ya malitere zawa.

Akụkọ fesara ebe niile taa na otu nwaokorobịa tigburu nwunye ya n’Enugwu Steeti.

Nwaokorobịa ahụ bụ Daniel Nnabuife gbara afọ 25 bụ onye e kwuru ji aka tigbuo nwunye ya mụrụ nwa ọhụrụ n’Enugwu Steeti.

Onye ntaakụkọ anyị hụrụ nwoke ahụ a na-ebọ ebubo na o gburu nwunye ya bụ Blessing Nnabuife gbara afọ 22 ebe ọ na-ebe nnukwu akwa sị na otu mkpụrụ akwụ ya tinyere n’ọkụ efuola.

Dịka ọ kọwara, nwunye ya bụ onye Ebonyị steeti mụrụ nwa ọhụrụ otu ọnwa gara aga mana kemgbe ọ mụchara nwa, ahụ ya niile na ụkwụ ya malitere zawa.

Onye nwe ụlọ ha bi na ya bụ Everest Nebo kwuru na ọ bụghị eziokwu na nwoke ahu tigburu nwunye ya kama na ọ bụ ahụ mgbu ka ọ na-arịa kemgbe ọ mụchara nwa otu ọnwa gara aga.

Leave A Reply

Your email address will not be published.