Take a fresh look at your lifestyle.

Godwin Emefiele sị na aka ya dị ọcha, EFCC akpọchie ya ọzọ

0 135

Onye bụbụ onyeisi ụlọakụ ukwu Naịjirịa bụ Central Bank of Nigeria, CBN ekwuola na aka ya dị ọcha n’ebubo 21 n’ime ebubo 26 ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC boro ya.

EFCC kpụgara Emefiele ụlọikpe ma ebubo na ikpe iji ikike ụlọọrụ ya mee ihe ndị na-adịghị n’ikike ya na inye ndị mmadụ ego ruru ijeri kwuru ijeri dọla.

Emefiele gara ụlọikpe ụbọchị Mọnde n’ihu ọkaikpe Jọstis Rahman Oshodi n’ụlọikpe dị n’Ikeja.

A kpụpụtara Emefiele na onye ọzọ a na-enyo enyo bụ Henry Omole.

A na-ekpekwa ya ikpe n’ebubo na o jiri ikike ụlọọrụ ya mee ihe ndị ọ na-ekwesighi ime malite n’afọ 2022 ruo 2023.

Leave A Reply

Your email address will not be published.