Take a fresh look at your lifestyle.

A nwụchiela mmadụ asatọ a na-enyo maka ogbugbu ndị uweojii na Delta Steeti

0 119

Aka akparala mmadụ asatọ a na-enyo enyo na aka ha dị n’ogbugbu ndị uweojii mmadụ isii n’ọhịa Ohoro dị n’okpuruọchịchị Ughelli North nke Delta Steeti.

Ndị uweojii a e gburu gụnyere Abe Olubunmi, Friday Irorere, Kunden Elisha, Akpan Aniette, Ayere Paul na Ejemito Friday – bụ ndị wakporo n’ụbọchị 23 Febụwarị mgbe ha gara ọrụ nzọpụtz.

Mgbe ọ na-ekwupụta nwuchi ndị a, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi kwuru na ndị anwụchiri nọ n’aka ha ugbua dịka ha na-enyere ha aka na nnyocha ha na-eme.

O kwuru na nwuchi ndị a site n’ime ezigbo nnyocha tara ọchịchị ma kwuo na a nwuchiburu mmadụ ise ngwa ngwa ihe a mere ebe mmadụ atọ ndị ọzọ ka a nwuchiri n’ebe dị iche iche.

“Ndị a nwuchiri nọ n’aka anyị ugbua dịka ha na-enyere anyị aka ime nnyocha. Ebe ndị uweojii na-agba mbọ ịhụ na ndị niile aka ha dị n’arụ ga-ata ahụhụ ruuru ha ngwa ngwa,”

“Ndị uweojii na-ekwe nkwa na a ga-akpụpụ ha n’ụlọikpe n’oge na-adịghị anya, ma e nwetezuo ihe akaebe, ma nyocha bịa na njedebe.”

Adejobi gara n’ihu kwuo na ndị uweojii na-agbasi mbọ ike inwuchi ndị niile aka ha dị n’arụ ọjọọ, ma kwee nkwa na o nweghi onye n’ime ha ga-agbanarị ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *