Take a fresh look at your lifestyle.

Senegal Election: Lee ebe ị ga-ahụ mpụtara ntuliaka ha

0 190

Ka ndị mba Senegal mechara ntuliaka ha, lee ebe ị ga-ele maka ịmata mpụtara ntuliaka.

Cheta na ndị zọrọla ọkwa Onyeisiala Senegal dị mmadụ anọ. Ha bụ:

  • Amadou Ba
  • Bassirou Diomaya Faye
  • Khalifa Sall
  • Idrissa Seck

Ụlọọrụ ndị na-ahazị ya bụ mpụtara ntuliaka ka na-atụkọọ vootu. O nwebeghị onye marala onye meriri.

Anyị ga-edebanye ya ebe a ka akụkọ a ga na-aga.

Ihe ruru mmadụ nde 7.3 n’ime mmadụ nde 18 denyere aha ịtụ vootu ga-apụta họpụta onyeisiala ọhụrụ mba Senegal, dịka otu nhazi ntuliaka mba Senegal si wee kwuo.

Onye ọbụla merirị na ntụlịaka ahụ ga-abụ onyeisiala nke ise kemgbe mba ahụ nwere onwe ha n’aka ndị ọcha n’afọ 1960

Onyeisiala mba ahụ bụ Macky Sall agaghị eso zọ ya bụ ọkwa.

Cheta na Sall n’onwe ya bughariri ya bụ ntuliaka e kwesịrị inwebu n’ọnwa Febrụwarị

Mana ndị mmadụ katọrọ ya maka nke a. Mana All na akọwa na ya mere ịhe dị na ịwụ.

Ụlọikpe ukwu mba ahụ ke kpebiri na okwu ya dara iwu ala ahụ nke mere ka etiyachi ntuliaka ahụ taa bụ ụbọchị 24 nke ọnwa Maachị.

Ụfọdụ na sị na ha ahụghị ohere ịtụ vootuna agbanyeghị na ha mere njem bịa ọdọ ntuliaka

Ụfọdụ ndị na-atụ vootu na mpaghara ụfọdụ na Senegal ekwuola na ha ahụbeghị ohere ịtụ vootu ha.

Otu nwamadị gwara BBC okwu sị na ọ gbara ụgbọ iji bịa mana n’ihe dịka elekere atọ n’ehihie, ya na ndị agbataobi ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *