Take a fresh look at your lifestyle.

Etu onyeisi Binance gọọmenti Naịjirịa nwụchiri si mipụ n’ụlọmkpọrọ

0 180

Ụlọọrụ Kripto bụ Binance agwala ndi nta akuko na onyeisi ha nke gọọmentị Naịjirịa nwụchiri anọghizi n’ụlọnga.

Ọnọdụ a na-abịa dịka enwetara ozi na-ekwu na otu n’ime ndị isi ụlọọrụ Binance abụọ gọọmentị Naịjirịa kpọchiri bụ Nadeem Anjarwalla apụọla n’ụlọnga.

A nwụchiri Anjarwalla bụ onye nwere akwụkwọ nkọwaonwe ‘passport’ mba Britain na nke mba Kenya n’ime ọnwa gara aga tinyere onye otu ya bụ Tigran Gambaryan n’ihi otu akụkụ ebubo ịgbanarị ụtụisi e boro ụkpụrụ mgbanwerịta ego kripo.

Otu onye na-ekwuru Binance sịrị “O doro anyị anya na Nadeem anọghizi n’ụlọnga Naịjirịa. Ihe mbụ anyị lekwasara anya bụ okwu nchekwa ndị ọrụ anyị mana anyị na-agbakọọrọ ndị ọchịchị Naịjirịa aka n’ọrụ iji dozie nsogbu a na-egbughị oge.”

Cheta na akụkọ kwuru na Najeem gbara afọ 38 riri mbọmbọ n’ụbọchị Fraịde gara aga n’oge ndị nche na-elekọta ya duuru ya gaa n’ụlọ okpukperechi ndị Alakụba maka ekpere.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *