Take a fresh look at your lifestyle.

Kabaka onye otu egwu oriental brothers anwụọla.

Chigo

0 133

Nwa ya Iheanyi siri kwuo, nna ya anaghị arịa ahụ ọbụla kama ọbara ya gbaliri elu karịa etu o kwesịrị n’ụbọchị Tọzde, o nweghịkwa ụlọọgwụ gọọmenti hibere dị n’obodo ha ma ncha ha nwereike ibuga ya.

O sị na nna ya asizie etu ahụ nwụọ.

Kabaaka bụụrụ onye ọkpọụbọ nakwa ọgụegwu nke otu egwu Oriental Brothers International Band.

Ọ bụ onye Ụmụ Awara, n’Ụmụoye n’Imerienwe dị n’okpuruọchịchị Ngor Ọkpala n’Imo Steeti.

Ndị Igbo jiri otu egwu ya mara ya n’ụwa dum.

Ọ bụ na ngwụcha n’afọ 2023 ka Kabaaka tipụtara egwu ikpeazụ ya ọ kpọrọ ‘Abịala M (I am Back)’.Nwa nke nke ihe ị kwesịrị ịma maka Kabaaka

Kabaaka gara ụlọakwụkwọ Praịmarị n’ụlọakwụkwọ Baptist Primary School dị n’Imerienwe. O mechara gaa ụlọakwụkwọ n’Ọnịcha ma n’Enugwu. Ọ bụ n’ụlọakwụkwọ ya n’Enugwu ka ọ mụtara iti akwụrụngwa egwu.

Ka alụchara agha Bịafra, Kabaaka gara Legọọs ebe ọ malitere ịkwụ abọ nke ọma n’ụlọ ezumike otu Maazi Ikediala nke a kpọrọ Easy-Going Hotel ebe ọ na-eti egwu ya.

Ọ bụ n’ụlọ ezumike a ka o hibere ndị otu oti egwu a kpọrọ Oriental Brothers.

Maazị Godwin Kabaaka Opara bụ ọkpọ ụbọ mana ọ nọ n’afọ iri abụọ malite ya bụ otu otiegwu a.

E jiri ọtụtụ egwu mara Oriental Brothers n’oge ahụ. Otu a gakwara mba ụwa niile na-eti ya bụ egwu.

Esemokwu wee daa n’etiti ndị otu egwu a mere ha jiri tisaa.

Ka ha tisara, Kabaaka wee malitekwa otu egwu ya ọzọ a kpọrọ Kabaaka International Guitar Band nakwa Imo City Band.

Kabaaka lụrụ nwunye, mụọ ụmụ ma nwekwa ọtụtụ ụmụnne. Ndị na-eso egwu ya dị ọtụtụ na mba ụwa niile.

E jiri aha Kabaaka mara ebe o si – Imerienwe marakwa Imo steeti.

Maazị Godwin Kabaaka Opara bụ onye Ụmụ Awara, Ụmụoye, n’Imerienwe dị n’okpuruọchịchị Ngọ Ọkpaala, n’Imo steeti                                                                    BBC/IGBO

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *