Take a fresh look at your lifestyle.

Ọkachamara n’ihe gbasara nka na-akwalite ICT na ọrụ ugbo .

Na’ankwat Dariem, Abuja

0 154

Nentawe Yilwatda ,Onye prọfesọ nke Digital Systems Engineering,  akwadola maka nkwalite Ozi,  Nkwukọrịta  Nka (ICT) maka mgbanwe na mmepe n’irte uru ọrụ ugbo na iji hụ na enweghi uko nri.
N’ajụjụ ọnụ ya na Voice of Nigeria, o kwuru na enwere ike itinye ICT site na ntinye aka  na ndị na-emepụta ihe, na ngwa ọrụ nke ikesa ,ndị na-ere ahịa, ndị ga-eji ya mebe ihe  dika iri ya eri.
N’aka nke ọzọ, o kwuru na ndị na-azụ ahịa nwekwara ike ịnweta ihe ha choro na mgbasa ozi oha.
Enwere ike itinye maapụ satịlaịtị n’ọrụ ugbo, iji lelee maka njikwa ọrịa, na njikwa ụmụ ahụhụ, ịmara ihe ọkụkụ a ga-akụ n’oge kwesịrị ekwesị, nke ga-eme ka mmepụta ya dịkwuo elu.
“Ndị ọrụ ugbo a ga-achọ ikpo okwu chọrọ ọzụzụ. Nke a pụtara na gọọmentị ga-echerịrị maka ịzụ ndị ọrụ ugbo,” ka o kwusiri ike.
Dị ka Prọfesọ Yilwatda si kwuo, enwere ike ịzụ ndị ọrụ ugbo na ngwa teknụzụ kwụ ọtọ  iji kwalite uru ọrụ ugbo.
Ọ gbakwụnyere na “anyị nwere akụrụngwa na atumatu mana anyị chọrọ onye ndu nke nwere ike ịkwado maka nchekwa nri ga-enweta.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *