Take a fresh look at your lifestyle.

 Ahụ́ ọkụ Lassa abatala steeti Delta.

Omowumi Samuel.

0 151

Gọọmenti Delta steeti ekwenyela na mmadụ anọ nwere ọrịa Lassa na steeti ahụ na-agba ndị bi na steeti ahụ ume ka ha na-edebe gburugburu ha ọcha mgbe niile.

Kọmishọna na-ahụ maka ahụike bụ  Dọkịnta Joseph Onojaeme  na steeti Delta kwuru nke a n’ụbọchị Tọzdee ka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu gbasara ọnọdụ ntiwapụ nke ọrịa Lassa na steeti ahụ.

“N’ime izu 12, anyị enwetala ikpe anọ n’agbanyeghị na ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ maka ahụ ọkụ Lassa bụ 1-15%.

Kọmịshọna ahụ kwuru, “Ya mere, anyị na-eme ihe niile mmadụ kwesiri ime omume iji hụ na anyị na-ebelata mgbasa  ọrịa a.

“Ogbe ọchịchị ime obodo ndi o metụtara a bụ Okpe, Oshimili North, Oshimili South na Ndokwa East.

“O kwuru, “Anyị ekwesịghị ikpughe nri nye oke ma hụ na oke anaghị amụ n’ime ụlọ ma ọ bụ gburugburu.”

Dr Mildred Igumbor, onye na-ahụ maka ọrịa na-efe efe nke steeti kwuru na aka niile kwesịrị ịdị n’elu elu iji hụ na mkpochapụ ọrịa ahụ.

Ọ kọwara na Gọọmenti steeti ewepụtala EOC nke nwere ọtụtụ ngalaba nke gụnyere ndị ọrụ nke Ministry of Environment and Agriculture and Natural Resources na ndị ọzọ.

A na-ebute ọrịa Lassa site na nsị ma ọ bụ mmamịrị oke n’ihe oriri, yabụ anyị na-eme ka ndị bi na ya mara mkpa ka ha hụ na oke anaghị enweta nri ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *