Take a fresh look at your lifestyle.

Abụba oru:Ndị dọkịta Kenya kwụsịrị inye ọrụ mberede n’ụlọọgwụ ọha.

Chigo deziri ya n' Igbo.

0 152

Ndị dọkịta Kenya kwụsịrị inye ọrụ mberede n’ụlọọgwụ ọha na Tọzdee, ka ha ka nọọ na- agba abụba oru.

Ọtụtụ puku ndị dọkịta anọghị n’ụlọ ọgwụ kemgbe Tọzdee gara aga maka ụgwọ ọrụ na-adịghị mma na ọnọdụ ọrụ, n’agbanyeghị iwu ụlọ ikpe na-akpọ maka mkparịta ụka n’etiti ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụike.

Dọkịta Davji Bhimji  Onye na-ahụ maka ahụike na Kenya bụ odeakwụkwọ ukwu  kwuru na ndị dibia bekee kpalitere ya bụ abụba ọrụ ma kwụsị inye obere ọrụ n’ihi na gọọmentị egosighi mbọ ọ bụla iji dozie esemokwu ọrụ.

Ọ gwara ndị nta akụkọ na Wednesde.”N’ụtụtụ, anyị jisiri ike mechie ọrụ mberede a na-enye n’ụlọ ọgwụ mba Kenyatta,”

Susan Nakhumicha ,Mịnịsta na-ahụ maka ahụike  kwuru na ya enyela ndị ụlọọgwụ abụọ kacha elu n’ụlọ ọgwụ na-enye ndụmọdụ ka ha were ndị dọkịta nọchie ndị na-ekere òkè na mgbawa mba ahụ.

Ọ sịrị, “Anyị agaghị ekwe ka nsogbu mee… Anyị enweghị ike ịnwe oghere,” ka o kwuru, na-agbakwunye na enyere ndị dọkịta nnọchi nwa oge malite n’abalị Wenezde.

Akụkọ kwuputara n’ụtụtụ Tọzdee na ọrụ mberede na ụlọ ọgwụ Kenyatta National Referral Hospital dị na isi obodo Nairobi, amaliteghachila.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *