Take a fresh look at your lifestyle.

Putin anatala oche onyeisiala Russia nke ugboro ise

0 285

Vladamir Putin emeriela na ntuliaka mba Rọshịa dịka onyeisiala ga-achị afọ isii ọzọọ.

O nwetara mmeri na ntuliaka Rọshịa mere ụbọshị Satode mana mbaụwa anabataghị ntuliaka ahụ.

Putin achịala ugboro anọ, mmeri a ga-eme ya ugboro ise Putin ga-abụ onyeisiala Rọshịa.

N’ozi mmeri ya ka ọ nabatara mmeri na ntuliaka ahụ mere na ngwucha izuụka gara aga, Putin kelere ndị Rọshịa maka na ha pụtara tụọrọ ya vootu ma kwuo na mmeri ya ga-ewetara Rọsịa agamnihu.

Ọ nụrụ iyi na ya ga-ewulitesi ndị agha Rọshịa ike ka ha kwụrụ chịm megide mba Yukren ma kwuo na mmeri ya gosiri na ndị Rọshịa abụghị ndị a ga-amaja amaja.

Mana mbauwa anabataghị mmeri Putin. Onyeisiala mba Yukren bụ Vovodymyr Zelensky kwuru na “Putin bụ onye akaike ọchịchị na-eme ka mmanya nwereike ime ihe ọbụla iji dọtịa ọchịchị ya.

N’akụkụ nke ha, mba Amerịka katọrọ ntuliaka Rọshịa ma kwuo na ọ bụghị “nke a ga-atụkwasọ obi maka na Putin nwụchiri ndị na-azọ megide ya ma jụ na ha agaghị azọ”

Mba Briten n’onwe ha site n’ọnụ David Cameron bụ onye na-ahụ maka mmmekọrịta ha na mba ndị ọzọ katọrọ ntụliaka ahụ n’akara ya na X ma kwuo “ọ bụghị etu a ka ntuliaka tọrọ atọ si adị”.

Mba Jamini katọkwara ntuliaka ahụ gụnyere mba Polan mana mba Nọt Korịa na China zigara Putin ozi ekele maka mmeri ya.

Na nzaghachi mba dị icheiche katọrọ ya, Putin chịrị ọchịchi onye kwuo uche ya n’Amerịka ọchị ma kwuo “ntuliaka anyị ziri ezi ma nwee ntụkwasịobi, ọ bụghị n’Amerịka a na-ezipụ vootu n’ozi mmadụ ga-ejili $10 zụta vootu.

Putin jiri pasentị 87% merie na ntuliaka ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *