Take a fresh look at your lifestyle.

Nrụzigharị ụdọ ịntanetị ndị ahụ dọbiri n’osimiri nwereike iwe izuụka abụọ – MainOne

0 318

Ụlọọrụ MainOne bụ ndị nwe ụdọ ịntanetị ahụ dọbiri n’ime oke osimiri n’ụbọchị Tọzde ekwuola na o nwere ike iwe izuụka abụọ tupu e mezichaa ya.

Nke a dị n’ozi ha wepụtara iji kọwaara etu ya bụ ụdọ siri mebie, ihe butere ya nakwa usoro a ga-eji mezie ya.

Ha kwuru na iji mezie ụdọ ahụ, ihe mbụ a ga-eme bụ ịchọta ụgbọmmiri ga-enwe akụrụngwa niile a ga-eji mezie ya ma nyara ụgbọmmiri ha gaa ebe ụdọ a dọbiri ma mezie ya.

Ha kwuru na etu a ga-esi mee ya bụ i buru akụkụ ebe ụdọ ahụ dọbiri ma bugote ya n’ụgbọmmiri ahụ ebe ndị ọkachamaara ga-emezi.

Ha kwuru na nke a nwere ike iwe otu maọbụ izuụka abụọ maka na ha ga-achọta ụgbọmmiri ga-ebu ngwa ọrụ ndị ahụ si na mba Yorupe gawa mpaghara West Afrịka.

Ha jikwa ohere ahụ gbazie ndị mmadụ ole banyere ihe kpatara ụdọ jiri dọbie.

Ha kọwara na nsogbu ụdọ ịntanetị ndị a dị n’oke osimiri na-enwekaarị bụ site na mmadụ ịkụ azụ nakwa nkonye igwe n’osimiri, ihe ndị ọzọ alaọmajijiji, ala mbụze nakwa mmebi ngwa ọrụ.

Ha kwuru na site n’omimi ebe ụdọ nke a dị, na ha echeghi na ọ bụ mmadụ mere ya kama na ọ dị ka ọ bụ mgbanwe ọnọdụ ala ala mmiri a kpọro ‘seismic’ butere ya.

MainOne gara n’ikwu kwuo na ha ga-eme ka nchọpụta ọzọ ha nwere banyere mmezi ụdọ ịntanetị a pụta ihe.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *