Take a fresh look at your lifestyle.

Gaza War: UN sị na umuaka na-anwu maka agụụ, Amerịka zịgara ha nrị

0 444

Mba Amreịka ejirila ugbọmmịrị na-ebuga nrị na Gaza Strip ịjị nye aka beleta agụụ na mpaghara ahụ.

Nke a na eme dịka ndị otu mbaụwa United Nations UN na-adọ aka na ntị ma kwụọ na agụụ, na nnukwu ịhe ụkọ nke nwereike ịgbụ ọtụtụ ndị mmadụ na Gaza Strip ga-eme.

UN kwuru na nke a aghaghị ịme maka ọgụ ndị Hamas na ndị Agha Israel na mpaghara ahụ.

UN na-akọwa na ọo siri ike iji ụgbọelụ maọbụ ụgbọala bụga nrị maọbụ ịhe ọbụla na Gaza. Ha kwuru na ndị mbaụwa na-ahụ maka ịbụga nrị enyemaka ebe a na-alụ agha kwụsịrị maka na ha na-adaba n’aka ndị na-awakpo ha, bụrụ nrị ahụ.

Ha gbakwunye na ebe mmadụ ịse ka nwụrụ n’ụdịrị ọnọdụ ahụ mgbe ha sị n’ụgbọelụ jịrị parasụhtụ na-awụtụ n’ala.

Mana, ọchịagha na mba Amerịka, Frank Besson kwuru na ndị agha Amerịka ga-arụpụta ọnọdụ n’ebe dị nsọ n’akụkụ osimiri Gaza nke ga-enyere ha aka ị na-ebugara ndị nọ na mkpa nrị na gaza.

Onyesịala mba Amerịka, Joe Biden kwuru na ụgbọ mmịrị ahụ gawara Gaza ma kwụọ na “Ugbọ-mmịrị ahụ bụ ngwọ ọrụ a ga-ejị rụputa ọnọdụ n’akụkụ ọsịmịrị dị na Gaza”.

Ha na akọwa na ọga ewe ha ịhe dị ka abali ịrị ịsịi ịrụ ọnọdụ ha ebe ahụ.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.