Take a fresh look at your lifestyle.

A sị na ise onyonyo ndị otiegwu bụ ọrụ ụmụnwoke mana eji m ya aracha pịọm – Director Pink

0 364

Nwada Praise Onyeagwalam bụ onye ose foto na ihe nkiri egwu na Naịjirịa akọwaala etu o si malite njem n’ọrụ ahụ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo mere, Onyeagwalam kwuru na aka ọrụ ya n’ise ihe onyonyo egwu gbapụtara ihe n’afọ 2020, na-agbanyeghi na ọ bụ ụdịrị ọrụ ụmụnwoke jụpụtara na ya.

Nwada a e ji ‘Director pink’ maara kwuru n’ezie na ọ na-ara ahụ ụmụnwaanyị ime ọfụma n’ọrụ ha, kama na nwaanyị ọbụla tinyere uchu n’ọrụ ahụ ga-eme ọfụma.

Onyeagwala kwuru na ọ bụ n’ihi ya mere ndị na-arụrụ ya ọrụ jiri karịa n’ụmụnwaanyị. N’okwu ya “Ụmụnwaanyị ga-emenwu ya”.

Site n’ụlọọrụ ya bụ PinkLine Films, o meela ihe onyonyo ndị otiegwu a ma ama gụnyere Burna Boy, Phyno, Chike, Simi, Wizkid na ndị ọzọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *