Take a fresh look at your lifestyle.

Hannatu Musawa:Mịnịsta na-ahụ maka nkà, omenala na akụ na ụba na-eme ememe ncheta ụmụ nwanyị .

Hikmat Bamigboye dere ya na bekee.

0 321

 

Hannatu Musawa:Mịnịsta na-ahụ maka nkà, omenala na akụ na ụba na-eme ememe ncheta ụmụ nwanyị na ngalaba ụlọ ọrụ nka .
Musawa na-ekele ndị inyom niile na-enweghị atụ bụ ndị nyere aka na nka, omenala na akụ na ụba okike nke Nigeria.

 

Ọ sịrị, “Ụbọchị a bụ ihe ncheta maka ọmarịcha ihe ụmụ nwanyị rụpụtara n’ụwa niile na mmetụta bara nnukwu uru ha rụpụtara n’ịkpụzi obodo anyị.
“N’oge a dị ịrịba ama, anyị na-amata ma na-eme emume pụrụ iche , imepụta ihe na nkwụsi ike nke ụmụ nwanyị na nkà, omenala, na ngalaba ihe okike. Onyinye na ihe ọhụrụ gị emewo ka ihe nketa omenala anyị dịkwuo mma ma nyekwa aka n’ịkwalite ọganihu na mgbanwe dị mma na obodo anyị  n’ozuzu,” Musawa kwukwara.

“Gọọmentị etiti n’okpuru onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ga-aga n’ihu na-ewepụta ohere maka ụmụ nwanyị ka ha na-eme nke ọma na nka na omenala na ihe ndị ọzọ. Anyị ga-agba mbọ inye ụmụ nwanyị ike, nye ha usoro iji gosipụta ihe okike  na iji nka kpọrọ ihe.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *