Take a fresh look at your lifestyle.

Binance ga-akwụsị ịtụ mgbere metụtara naịra

0 285

Ụlọ mgbanwerita ego dijital a na-akpọ Binance ekwuola na ha ga-akwụsị mmekọrịta niile na azụmahịa niile gbasara ego Naịjirịa bụ naịra.

Binance bụ ụloọrụ kachasị agbanwekọrịta ego krypto n’ụwa niile kwuru na malite abalị asatọ ọnwa Maachi, ihe niile ha na-emebu e ji ego naịra eme ga-ebi.

N’akwụkwọ ha bipụtara n’akara sosha midịa ha, “Binance ga-ewepụ naịra site n’ego ndị ha na-anabata e ji akwụ ụgwọ n’ime app ha.’

Nke a na-abịa ka gọọmentị Naịjirịa machiri ma mechie ndị mmadụ inwe ike ibanye n’ime app ha n’ọnwa Febuwarị na-ebo ha ebubo ime mpụ.

Gọọmentị Naịjirịa boro ha ebubo na ha mere ego naira ji na-ada n’ihi na mekwa ka ego na-efularị Naịjirịa.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *