Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ Ọrụ Nkesa Ọkụ Eletrik Nke Naijiria Enwetala Ndị Isi Nchịkwa

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 264

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akwadola nhọpụta Injinia Oluwagbenga Ajiboye ka ọ bụrụ onye isi oche nke ụlọ ọrụ nkesa ọkụ eletrik nke Naijiria bụ Transmission Company Of Nigeria, TCN n’aha mkpirisi.

Onyeisiala kpọkwara Injinia Nafisatu Asabe Ali ka ọ bụrụ onye isi ụlọ ọrụ Independent System Operations, Ochije Ogini Chukwuka dịka onye isi ngalaba na-ahụ maka ego na akaụntụ na Abiodun Foluso Afolabi ka ọ bụrụ onye isi nchịkwa nke Human Resources & Corporate Services.

Ozi nke onye na-ekwuchitere onye isi ala, Ajuri Ngelale binyere aka, kwuru na ndị ọkachamara ndị a ga-eje ozi oge mgbanwe nke afọ anọ.

 

 

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.