Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Ekwuputara Nkwa Ezi Ọchịchị Etiti

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 307

Onyeisiala Naijiria, Bola Ahmed Tinubu ekwuola na mba ahụ ga-emeri nsogbu akụ na ụba dị ugbu a ka ọ na-ekwughachi ọrụ ya nke ịhụ na mmefu ego na ezi gọọmenti etiti.

Onyeisiala ahụ kwukwara na ọchịchị ya na-agba mbọ hụ na e mezigharịrị Naijiria maka ịrụ ọrụ nke ọma na-emesi ike n’usoro ịkụnye izi ezi na nha anya n’akụkụ niile nke ndụ obodo.

E mere ka a mata nke a na nkwupụta nke onye ndụmọdụ pụrụiche nye onye isi ala na mgbasa ozi, Ajuri Ngelale wepụtara na Wenezde.

Mgbe ọ na-agwa ndị isi Afenifere okwu n’ụlọ Pa Reuben Fasoranti dị n’Akure, Ondo steeti, Onyeisiala kwusiri ike na nkwa ya na-eduga Naijiria n’ọganihu akụ na ụba na ọha mmadụ.

Ọ sịrị; “Naijirịa ga-alanarị nsogbu akụ na ụba dị ugbu a. Enwere ìhè na njedebe nke ọwara ahụ. Arịọrọ m ọrụ ahụ, anaghị m eme mkpesa banyere ya. Ana m ewere ọrụ zuru oke.

“Anyị na-arụ ọrụ anyị na mba ụwa. Maka ndị na-agbazinye ego, anyị na-eme nke ọma, anyị ga-agakwa n’ihu ime nke ọma. Anyị na-emeri ihe aka mgba nile dị n’ụzọ ọganihu Naijiria,” Onye isi ala kwuputara.

Na imeghari Naijiria, Prezidenti Tinubu kwuru na ọrụ ya ga-abụ ịhụ maka ezi mmefu ego na ezi ọchịchị etiti, yana igosipụta ihe ọmụma nke “ihe dị onye mma ga-adịkwaazị ibe ya mma.”

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.