Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Na-Eru Uju Onyendu APC Bụ Cairo Ojougboh

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 262

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akasiwo ezinaụlọ Ojougboh, gọọmentị na ndị Delta steeti dị na ndịda Naijiria maka ọnwụ Dọkinta Cairo Ojougboh, onye bụbu onye isi oche nke Niger Delta Development Commission (NDDC).

Na nkwupụta nke ọnụ na-ekwuchitere ya, Ajuri Ngelale binyere aka, onye isi ala kwuru na ya ji obi dị arọ nata ozi banyere ọnwụ Cairo Ojougboh.

Ka ọ na-ekpe ekpere maka ezumike udo nke ndị ahụ hapụrụ, Onyeisiala Tinubu gbara ezinụlọ Ojougboh ume ka ha nweta ume na nkasi obi n’ime Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile.

Onye isi ala gbakwara ezinaụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ ume ka ha nweta nkasi obi na ncheta na ihe nketa nke onye isi APC nwụrụ anwụ.

Dọkịnta Ojougboh bụ onye otu ụlọ omebe iwu site n’afọ 2003 rue 2007 na onye isi otu All Progressives Congress (APC) na steeti Delta.

Cairo Ojougboh bụ dọkịta Naijiria tụgharịrị bụrụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye ọchụnta ego, onye amuru na abalị asatọ ọnwa Septemba afọ 1959, na ime obodo Agbor dị n’okpuru ọchịchị Ika South nke Steeti Delta.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *