Take a fresh look at your lifestyle.

Onwu Mohbad: Ndị uweojii ejichiela Naira Marley

0 206

Ndị uweoji Legọs anwụchiela otiegwu Azeez Fashola onye a ma dịka Naira Marley, maka ebubo na aka ya dị n’ọnwụ otiegwu Ilerioluwa Aloba, onye a ma dịka Mohbad.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjami Hundeyin kwupụtara nke a n’akara soshal midia ya n’abalị Tuzde.

Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n’ime ya, họrọ ‘nabata na gaa n’ihu’.

A na-atụ anya na Naira Marley ga-enyere ndị uweojii aka na nnyocha ha na-eme gbasara ọnwụ Mohbad bụ onye nọbụ n’otu egwu Naira Marley tupu ha abụọ enwee nghọtahie.

Naịra Marley tinyekwara n’akara soshal midia ya na ya lọbatara na Naịjirịa iji nye aka na nnyocha a na-eme.

“Mụ na ndị uweojii ga-enwe ọgbakọ, olileanya m bụ ka eziokwu pụta ihe, ka ikpe ziri ezi guzosie ike,” ka o dere.

Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n’ime ya, họrọ ‘nabata na gaa n’ihu’.

Cheta na ndị uweojii nwụchikwara otu onye ntorobịa a ma ama bụ Sam Larry, bụ onye e boro ebubo na ọ kpọrọ ndị mmadụ ga tie Mohabd ihe n’oge gara aga.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *