Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị na-eme ngagharịiwe akwatuola ọnụụzọ ụlọomeiwu Naịjirịa

0 267

Ndị Nigeria Labour Congress (NLC) na-eme ngagharịiwe akwatuola ọnụụzọ ụlọomeiwu dị n’Abuja n’ụbọchị 2 Ọgọstụ 2023.

Nke a mere mgbe ndị a buuru ngagharịiwe gaa n’ụlọomeiwu, ya bụrụ na a gbachiri ọnụụzọ ya a gbachi.

Ha bidoro na-akwa ụzọ ahụ aka ma na-eti mkpu ka a gbapee ya mana ha mechara kwatuo otu ngalaba ọnụụzọ ahụ.

Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) agaala isi akwara ma malite abụbụọrụ na ngagharịiwe ha taa bụ Wenezde 2 Ọgọstụ, 2023.

Otu a gara n’ihu ime nke a na-agbanyeghi mgbasaozi Onyeisiala Tinubu mere maka ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ma kwee nkwa ibuli ego ọnwa ha.

Abụbụọrụ na ngagharịiwe a ga-eme na steeti niile dị na Naịjirịa bụ ebe ndị otu a ga-agbakọta ma kpagharịa n’ebe dị iche iche.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *