Take a fresh look at your lifestyle.

‘Colos’, ‘laughing gas,’ na ọgwụike ndị ọzọ na-ekopu, edula ụfọdụ ndị ntorobia

0 300

N’ebe ọnwa Eprelụ, 2023 ndi nta akuko Igbo mere njem ma chọpụta maka ọnwụ otu nwaokorobịa n’akụkụ Surulere, Legọs bụ onye e chee ịṅụ ọgwụike ‘Colos’ dulara mmụọ.

Otu enyi ya gwara ndi nta akuko Igbo na “n’isi ụtụtụ ahụ, anyị batara n’ime ụlọ ebe ọ na-akpụ ndị mmadụ isi ma hụ na ọ dara ma gharazie ịmata onwe ya”.

Enyi nwaokorobịa a gbara ama na ha ma na ọ na-aṅụ ọgwụike ‘Colos’ mana o doghi anya etu o siri ṅụọ ya n’abalị wụba n’ime ụlọ ebe na-akpụ isi ma daa.

Nwaamadị a nke ndị ma ya kwuru bụ “onye nwere ezigbo obioma ma bụrụ onye ọṅụ juru ahụ” mechara laa mmụọ dịka ọ pụtaghị ụlọọgwụ ebe e bụgara ya na ndụ.

Ọgwụike dị iche iche ewuola ma fesaa n’oge gara aga na Naịjriịa mana ikuku ọgwụike ọhụrụ ndị ọzọ amalite ifesa n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche ugbua dịka ụlọorụ na-ebu agha megide ọgwụike na Naịjirịa bụ NDLEA siri kwuo.

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) bụ Femi Babafemi gwara ndi nta akuko Igbo na “nnyocha mbaụwa e mere n’akụkụ na Naịjirịa 2018 banyere ịṅụ ọgwụike gosiri na Igbo bụ ọgwụike ndị mmadụ kacha aṅụ”.

Ọ gara n’ihu kwuo na n’ime nde mmadụ 13 na ụma e jidere na-aṅụ ọgwụike na Naịjirịa, nde 10 na ụma kwuru na ha na-aṅụ ọgwụike igbo”.

Babafemi kwuru na ihe mere ha ji ebusosi ọgwụike a agha bụ etu ha siri nyochapụta na “e nwere njịkọ dị n’etiti ịṅụ ọgwụike nakwa nsogbu nchekwa dị na Naịjirịa”.

Leave A Reply

Your email address will not be published.