Take a fresh look at your lifestyle.

Etu onye nkuzi jiri aka higbuo nwata n’ụlọ akwụkwọ n’Ondo steeti

0 440

N’obodo Arogbo n’okpuruọchịchị Ese-odo nke Ondo steeti nọ n’akwa arịrị kamgbe ụbọchị Mọnde ụbọchị 3 Julaị 2023 maka otu onye nkuzi e boro ogbugbu otu nwa dị afọ iri na asaa a kpọrọ Timibra Meretighan n’ụlọakwụkwọ dị n’Ondo steeti.

 

Dịka onye ntaakụkọ ndi nta akuko Yoruba siri kwuo na Timibra na ndị enyi ya na-ele ule ha n’ụlọakwụkwọ Ijaw National High School dị n’Arogbo n’ụbọchị ahụ tupu Oke abaa n’ime ụlọakwụkwọ ha ịchụpụ ụmụakwụkwọ n’ezi. Anya hụrụ ihe mere kọwara na onye nkuzi ha na-achupụzịa ụmụakwụkwọ n’ezi wee jiri aka ya higbuo Timibra olu.

Ihe a wee kpata mkpọtụ na ọgbaaghara tupu ndị uweojii wee machie nwoke ahụ n’ụlọakwụkwọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *