Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka onyeisiala gara n’ihu leba n’akwụkwọ Peter nke Labour Pati gbara Onyeisiala Bola Tinubu, ụlọọrụ Inec nakwa pati APC.
N’ikpe nke taa, Obi na Labour Pati gosiri ihe akaebe ha nwe banyere etu ntuliaka si gaa na Niger, Oyo, Osun, Edo, Adamawa, Ogun, Ekiti, Rivers na Akwa Ibom steeti.
Ihe ha gosiri bụ akwụkwọ akaebe a kpọrọ ‘form EC40G nakwa EC40GBU” bụ nke ụlọọrụ Inec banyere aka na ya.
Ndị ọkaiwu APC, Inec, Tinubu na Shettima jụrụ ịnabata akwụkwọ akaebe ndị a mana ụlọikpe gara n’ihu nabata ha dịka ihe a ga-eji ekpe ikpe.
Dịka nke a mechara ọkaiwu Labour Pati bụ Livy Uzoukwu gwara ụlọikpe na ha ka nwere ihe akaebe ndị ọzọ igosi mana na oge ha agaala, ma rịọ ka ụlọikpe nye ha ụbọchị Wenezde iri na ano nke onwa Juun, 2023 ime nke a.
Ndị ọkaikpe nọ n’isi ikpe ahụ nabatara arịrịọ ya ma yigharịa ụbọchị ikpe ahụ gawa ụbọchị Wenezde.
Leave a Reply