Take a fresh look at your lifestyle.

Godwin Emefiele: DSS anwụchiela onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa

0 333

Ụlọọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ ‘Department of State Services (DSS) ekwuola na ha ejichiela Godwin Emefiele, bụbu onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa.

Ọnụ na-ekwuru ndị DSS bụ Peter Afunanya kwupụtara nke a site n’akara Twitter nke ngalaba ahụ.

Nke a na-abịa ihe dịka awa abụọ maọbụ ata Afunanya kwuchara na ha ejideghị Emefiele.

Akụkọ malitere ifegharị n’ụbọchị Satọde nke kwuru na ndị DSS jidere Emefiele.

Nke a na-abịa dịka akụkọ kwuru na Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akwụsịla Emefiele ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti na mgbede ụbọchị Fraịde, bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Jun 2023.

N’ebe elekere iri nke ụtụtụ Satọde, DSS zipụtara ozi n’akara Twitter ha ma kwuo sị: “Ka ọ dị ugbua, Emefiele anọghị n’aka DSS.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *