Take a fresh look at your lifestyle.

Nri ‘GMO’ ọ nwereike imetụta ahụike gị?

0 775

Ka ụwa dị ugbua, ndị ọrụ sanyesi etinyela aka na bụ ọrụ dịka ha na-ewepụta echiche ọhụrụ n’ọrụ ha nke e ji ahazi ime ahụ osisi, mkpụrụ osisi dị iche nakwa ụmụanụmanụ dị iche iche.

Atụmatụ ha na nke a bụ ikwalite agwa ọma ndị ha chọrọ ka ọ mụbanwanye n’ime osisi ndị a n’oge owuwe ihe ubi maọbụ n’ime ụmụanụmanụ ndị a n’oge ọmụmụ a.

Genetically modified organisms (GMO) pụtara nrị eji usoro sayensị hazie ime ahụ ya.

A na-eji usoro a eme ka ihe owuwe buo oke ibu maọbụ wepụ agwa a chọghị n’ahụ ihe owuwe dịka ime ka oroma ghara inwe ọtụtụ mkpụrụ.

Mana dịka mepụta nri GMO a na-amụba, ndị mmadụ amalite ịjụ, iri nrị ‘GMO’ ndị a, ọ na-emetụta ahụike mmadụ n’ụzọ ọjọọ?

Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ sayensi na-enwe ndọrịtaụka n’okwu a.

Otu onye ọrụ sanyesi bụ onye ọkaibe n’okwu gbasara GMO nke aha ha bụ Bernard Ehirim gbara ama na enweghị ihe ọbụla enyochapụtarala nke kwuru na GMO na-emetụta ahụike mmadụ n’ụzọ ọjọọ.

O kwuru “kepu kepu ndị na-ekwu na ọ nwereike ibunye mmadụ kansa, maọbụ mgbakasịahụ nke ‘allergies’ maọbụ na o nweghị uru nri achịtaghi àjà.”

“Ụlọọrụ dị iche iche n’ụwa na-enyocha ma na-ahụ na nri ndị a tozuru oke. Ndị a na-ama imi n’ala n’okwu a. Na Naịjirịa, ụlọọrụ ‘National Biosafety Management Agency’ nnyocha n’okwu a ma nye ndị mmadụ ikike iri ya”

Ehirim kọwara na etu e si enyocha GMO ugboro ugboro karịrị etu e si enyocha nri ọnatarachi nke mere o jiri bụrụ ihe a na-agbara ezi ama na enweghị ihe ọjọọ nọ n’ime ya.

Ihe ndị ọzọ na-eche ndị mmadụ maka GMO

Agbanyeghị uru ndị ọrụ sayensi so nri ndị a nwere, ọ nwere ihe ndị ọzọ na-eche ndị mmadụ echiche banyere ya dịka:

  1. ka nwere ndị ọrụ sayensi na-atụ egwu etu iri nrị ndị a nwereike isi metụta mmadụ n’ọdịnaihu. E nwekwara ihe ndị ọzọ na-akpata okwu ma akụkọ GMO pụta dịka ụfọdụ ụlọọrụ ndị na-emepụta nri GMO nwereike ijibido nrị ndị ma kwuo na ọ bụ ihe mmepụta aka ha.

Nke a bụ na ha nwereike isi ndị na-akụpụta nrị ka ha ghara ijichie mkpụrụ osisi ha.

  1. Ndị otu na-alụ ọgụ ikike dịrị onye maka mmetọ ihu eluigwe na-ekwu na usoro e ji emepụta nri GMO na-akwado mmetọ ihu eluigwe nke na-emetụta ahụike ndị mmadụ n’ọdịnihu mana ọtụtụ ndị ọrụ sayensi na-ekwu na nke a abụghị eziokwu.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *