Take a fresh look at your lifestyle.

Onye Bụbu Onye Isi Ndị Ọrụ Enyefeela Onye Ga-anọchi Anya Ya

Peace Kanu dere ya na bekee

0 311

Onye isi ndị ọrụ nke onye isi ala Muhammadu Buhari bụ Ọkammụta Ibrahim Gambari enyefeela Femi Gbajabiamila nọchiri anya ya.

Emume nnyefe a mere n’ụlọọrụ onyeisiala dị n’Abuja n’ụbọchị Mọnde n’ihu onyeisiala bụ Bola Ahmed Tinubu.

Nke a mere tupu abalị iri na anọ ọnwa Juun, 2023 mgbe ọ ga-ewere ọrụ ya dị ka onye isi ndị ọrụ nye Onyeisiala.

Onyeisi ụlọ omebe iwu na-apụ apụ bụ Gbajabiamila ka a mara ọkwa dịka onye isi ọrụ nye onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ụbọchị Fraide gara aga.

 

 

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *