Take a fresh look at your lifestyle.

Ọgbaaghara egbuola otutu mmadụ na mba Sudan

0 444

Ọgụ dapụtara n’etiti ndị otu agha abụọ na mba Sudan egbuola ihe ruru mmadụ iri ise na isii ebe mmadụ nari ise na iri itolu na ise merụrụ ahụ ọkachasị n’ịsị obodo Khartoum mba ahụ.

Ọ bụ okwu maka ịnyefe ọchịchị n’aka ndị nkịtị bidoro ọchịchị bidoro esemokwu n’etiti ndị agha gọọmentị na ndị otu agha Rapid Support Forces (RSF).

Ọgụ a bụ n’etiti ndị agha na-akwado onye nọ n’ọchịchị bụ Abdel Fattah al-Burhan na pnye chịagha ndị agha RSF bụ osote onyeisi ọchịchị mba Sudan bụ Mohamed Hamdan Dagalo, e ji Hemedti mara.

Kamgbe ndị agha napụrụ ndị nkịtị ọchịchị n’ike n’afọ 2021, ọ bụ ndị ọchịagha na-achị mba ahụ kamgbe.

Ugbua ndị agha abụọ na-ekwu na ọ bụ ha ji ọdọ ụgbọelu na ebe ndị ọzọ dị mkpa n’ebe ahụ.

Taa bụ ụbọchị sụnde, ndị mmadụ na-anụ ụda ogbunigwe na mpaghara Omdurman bụ mpaghara jikọrọ Khartoum na Bahri.

Ugbua, Hemedti na-ekwu na ndị agha ya ga-alụgịde ọgụ tutu ha anapụ ndị agha gọọmentị.

Ebe ndị agha gọọmentị na-ekwu na ha agaghị enwe mkparịtaụka ọbụla tutu ndị agha RSF etisaa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *