Take a fresh look at your lifestyle.
independence

Ngụkọ mpụtara ntuliaka n’Enugwu Steeti ga-amalite ọzọ n’elekere ise

0 239

Inec ekwuola na ngụkọ mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ n’Enugwu steeti ga-amalite ọzọ n’elekere ise nke mgbede taa bụ Wenezde,abali iri abuo na abuo nke onwa Maachị, 2023.

Ọnụ na-ekwuru Inec n’Enugwu bụ Victor Okafor gwara ndi ntaakuko nke a ma kwuo na a ga-akapị mpụtara ntuliaka niile ahụ ọnụ ma kpọpụta onye meriri.

Cheta na Inec kwụsịtụrụ ngụkọ mpụtara ntuliaka n’Enugwu n’ihi nghọtahie dapụtara na mpụtara ntuliaka si n’okpuru ọchịchị Nsukka na nke Nkanu East.

Nghọtahie a mere ka ndịnkwado PDP na Labour Party malite ngagharịiwe, ndị ọbụla n’ime ha na-ekwu na ọ bụ onye nke ha meriri.

Ka o dị ugbua, a ka na-eche ịmata onye ga-enwe mmeri n’ime Peter Mba nke PDP na Chijioke Edeoga nke Labour Party.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.