Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Buhari laghachiri Abuja ka emechara ntuliaka

0 344

Onyeisiala bu,Muhammadu Buhari na-ala Abuja ka emechara ntuliaka gọvanọ na nke ndi omeiwu steeti. Ọ gara ọdụ ụgbọ elu Katsina n’ụtụtụ Mọnde n’ihe dịka elekere 10:35 GMT.                                                                                                                                                                                                                     Aka na-achị Katsina steeti bụ Aminu Masari nọ n’ọdụ ụgbọ elu iji kelee onyeisiala. Ndị nọkwa ya bụ ụfọdụ ndị otu ọchịchị steeti ahụ na ndị isi otu ndorondoro All Progressives Congress (APC).                                                                                                                                                                                      Onye ndu Naijiria abatala steeti Katsina n’ụlọ ya n’ụbọchị Fraịde wee tụnye votu ya na ntuli aka gọvanọ na nhoputa ndi ochichi steeti na Satọde.          Ya na nwa ya nwoke bụ Yusuf, ụfọdụ ndị ezinaụlọ mbụ na ndị enyemaka onwe ya so ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *