Take a fresh look at your lifestyle.

Akwụkwọ Ego N200 N500 N1000 Ochie Ka Dị Ire – CBN

0 406

Ụlọ akụ etiti bụ Central Bank of Nigeria (CBN) ekwuola na akwụkwọ ego N200, N500 na N1,000) ochie ga-adịgide ire ruo abalị iri atọ na otu ọnwa Disemba afọ 2023.

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi ụlọọrụ CBN bụ Isa AbdulMumin kwupụtara nke a na mgbede Mọnde, Maachị 13, 2023.

Nke a na-abịa dị ka Ụlọikpe etiti nọọrọ n’abalị atọ ọnwa Maachị kpebie na akwụkwọ ego naira ochie na nke ọhụrụ kwesịrị ịgakọrịta ruo na ngwụcha afọ.

“Na ndabanye irube isi n’iwu, enyela ndị ụlọ akụ na-arụ ọrụ na Naịjirịa ka ha mejupụta ihe Ụlọikpe etiti kpebiri n’abalị atọ ọnwa Maachị, 2023.

“N’otu aka ahụ, CBN ezutela ndị kọmitii ụlọ akụ ma nye iwu ka akwụkwọ ego N200, N500 na N1000 ochie ka dị ire n’akụkụ akwụkwọ ego ndị ahụ emeghariri emegharị ruo abalị iri atọ na otu ọnwa Disemba, 2023.

“N’ihi ya, a na-agwa ndị niile nke a metụtara ka ha tinye ndụmọdụ a n’ọrụ.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *