Take a fresh look at your lifestyle.

Charles Soludo: Ị tụnyere omeiwu abụghị Apga, ọrụ mmepe agaghị eru mpaghara gị aka.

chigo

0 300

Charles Soludo: Ị tụnyere omeiwu abụghị Apga, ọrụ mmepe agaghị eru mpaghara gị aka.

Aka na-achị Anambra steeti bụ Charles Soludo ekwuola na ya na ndị omeiwu steeti ahụ abụghị ndị otu Apga agaghị arụkọ ma ọ bụrụ na-atụnyere ha vootu na ntuliaka na-abịa.

Soludo kwuru nke a na nsonso a n’ ọgbakọ ya na ndị otu Apga nwere n’Ọka, isiobodo Anambara steeti tupu ntuliaka a kwadoburu ime n’abalị 11 nke ọnwa Maachị, afọ 2023 mana ihe onyonyo ya malitere wuwe na soshal midia ụbọchị Tọzde.

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka tinyeburu ntuliaka gọvanọ nakwa ụlọomeiwu steeti n’abalị 11 nke ọnwa Maachị, afọ 2023 ma hihari ya gaa abalị 18 nke ọnwa Maachi iji nye ha o here ịhazi igwe Bivas maka ntuliaka ahụ.

N’ihe onyonyo ahụ nke ndị ntaakụkọ na ndị na-akwado pati ya gbakọrọ, Soludo kwuru na ọ na-atụ anya na ndị mmadụ ga-apụ tụọọ Apga vootu n’igwe sị, sịrị,,

“Maka onye mụ na ya ga-anọ na-arụ ya ga-abụ onye Apga, Ị tụọrọ onye ọzọ, ị mara na ọ bụ sọ ụgwọọnwa ya ka ọ ga na-eri.”

“ A kwụọ ya ụgwọọnwa ya, ọ laa be ya.”

“ Onye nọ n’ụlọoemiwu anaghị arụ okporoụzọ,ọ naghị arụ ụlọọgwụ, ọ naghị ụlọakwụkwọ, maka ego ole ka o nwere.”

BBC

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *