Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission, INEC ekwupụtala Bola Ahmed Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka onyeisiala nke afọ 2023 mere na Satọde abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Febụwarị. Onye isi oche INEC bụ Ọkammụta Mahmood Yakubu kwuru na “Na Tinubu Bola Ahmed nke APC, ebe o mezuru ihe iwu chọrọ, a na-ekwupụta ugbu a onye mmeri ma weghachi ya n’ọkwa,” Mahmood kwuru na a ga-ewepụta Asambodo nloghachi maka Onye isi ala na osote onye isi ala a họpụtara site n’elekere atọ nke abalị. na Wednesde na National Collation Center. Tinubu, onye na-azọ ọkwa onyeisiala nke All Progressives Congress nwetara vootu 8,794,726 iji merie onye ya na ya na-akpachi anya bụ Atiku Abubakar nke People’s Democratic Party onye nwetara vootu 6,984,520. Ndị ọzọ so na ntuliaka ahụ bụ onye na-azọ ọkwa Labour Party, Peter Obi onye nwetara vootu 6,101,533 na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị New Nigeria bụ Rabiu Kwankwaso nwetara vootu 1,496,687. Voice of Nigeria na-akọ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị iri na asatọ sonye na ntuliaka kpụ ọkụ n’ọnụ nke nwere ngụkọta ndị debanyere aha n’akwụkwọ ntuliaka na mba ahụ dị 93,469,008, ndị kwadoro ntuli aka dịka 25,286,616, vootu ziri ezi dịka 24,025,940 na jụrụ vootu dịka 939,278. votu ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọ bụla na ndị na-azọ ọkwa onyeisiala ha nwetara dịka ndị a: Accord (A), Prof. Christopher Imumulen- 61,014 Action Alliance (AA) Almustapha Hamza-14,542 African Action Congress (AAC) Omoyele Sowore-14,608 African Democratic Congress (ADC) Dumebi Kachikwu-81,919 Action Democratic Party (ADP) Sani Yabagi -43,924 All Progressives Congress (APC) Sen. Bola Tinubu-8,794,726 All Progressives Grand Alliance (APGA), Prof. Peter Umeadi -61,966 Allied Peoples Movement (APM), Princess ChiChi Ojei-25,961 Action Peoples Party (APP) Nnadi Charles Osita-12,839 Boot Party (BP), Adenuga Oluwafemi-16,156 Labour Party (LP), Peter Obi -6,101,533 New Nigeria Peoples Party (NNPP), Sen. Rabiu Kwankwaso-1,496,687 National Rescue Movement (NRM) Osakwe Felix Johnson -24,869 Peoples Democratic Party (PDP) , Atiku Abubakar-6,984,520 Peoples Redemption Party (PRP), Kola Abiola-72,144 Social Democratic Party (SDP) Prince Adewole Adebayo-80,2067 Young Progressive Party (YPP) Prince Abdulmalik Ado-Ibrahim-60,600 Zenith Labor Party (ZLP) Nwanyanwu Daberechukwu-77,665
Leave a Reply