Take a fresh look at your lifestyle.

Inec awụchịela n’ọgbọ ntuliaka a na-atụ anya na Atiku Abubakar ga-atụ vootu

0 354

Ọgbọ ntuliaka Ajiya iri na abụọ dị na Gwadabawa Wọọd, nke Yola Nọt, Adamawa steeti.Image caption: Ọgbọ ntuliaka Ajiya iri na abụọ dị na Gwadabawa Wọọd, nke Yola Nọt, Adamawa steeti.

Ndị ụlọọrụ Inec eburula nkụrụngwa ha wụchie n’ọgbo ntuliaka Ajiya iri na abụọ dị na Gwadabawa Wọọd, nke Yola Nọt, Adamawa steeti.

Ihe a bụ ebe a ana-atụ anya na Atiku Abubukar na-azọrọ People’s Democractic Party (PDP) ọkwa onyeisiala ga-atụ vootu ya taa.

Onye bụbụ ụlọomeiwu Naịjriịa bụ Awwal Tukur nọkwa ebe ahụ dịka o kwuru na kwa afọ, ọ na-anọ na ya bụ ọgbọ atụ vootu.

O kwuru “Na ntuliaka ndị ọzọ, ndị mmadụ ekwesila iju ebe a ugbua.” “Ahụghịkwa m ụmụnwaanyị ọbụla ebe a”

Ọtụtụ ndị ntaakụkọ juru ebe a dịka ndị obodo ahụ na-apụta ugbua isonye mee ntuliaka nke taa.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.