Take a fresh look at your lifestyle.

Isi okwu Ngwuputa akuchinyere na Naijiria dara site na 36.6%

0 611

Ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke akuchinyere ndị e nyere ụlọ ọrụ na-egwupụta akụ agbadala site na 36.63 pasent n’ime afọ ise.                                                           Nke a dị n’akwụkwọ ngosi nke Minister nke Mines na Steel Development, Olamilekan Adegbite, na mbipụta nke itoolu nke ọchịchị President Muhammadu Buhari Scorecard 2015 ruo 2023 usoro nke Ministry mgbasa ozi na omenala haziri.                                                                                          Akwụkwọ ahụ gosipụtara nke gosiri na e nyere aha akuchinyere 2815 na 2016, ebe 1438 nyere na 2021.                                                                                       O gosikwara na enyere aha akuchinyere 2,258 na 2016, 2429 na 2017, 2124 na 2018.                                                                                                           Agbanyeghị, edere mkpọda mgbada site na 2019, ka ewepụtara aha 1,620 n’afọ ahụ, ebe aha akuchinyere 1,438 nyere n’etiti Jenụwarị na Ọktọba 2022, nke bụ pasenti 48.92 sitere na nke ewepụtara na 2016.                                                                                                                                                                           Utu aha ịnweta ahụ gụnyere igwu ala, nchọgharị, ebe a na-egwupụta ihe, na akwụkwọ ikike igwuputa obere obere.                                                                Onye isi oche nke Nigeria Mining Cadastre Office, Mazi Obadiah Nkom, n’oge mkparịta ụka nke Ụlọ Nzukọ Ọchịchị nke Òtù Na-ahụ Maka Nkwukọrịta Ọchịchị kwadoro, na nso nso a kwuru na a kagburu aha 3,402 maka ịdaba na usoro nke ikikere ha.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.