Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe el-Rufai kwuru banyere nsogbu ego ọhụrụ

0 347

Aka na-achị Steeti Kaduna bu Nasir El-Rufai eboola ebubo na o nwere ndị nọ n’ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari achọghị ka pati ha bụ APC merie na ntuliaka.

El-Rufai kwuru nke n’ụbọchị Wenezde na mkparịtaụka ya na Channels TV nwere.

Ọ rụtụrụ aka na ibipụta ego naira ọhụrụ na ụkọ mmanụ ụgbọala nke mere ọtụtụ ụmụ Naijiria ha were eze ekpe ekwere ugbua na mpaghara dị iche iche n’ala Naijiria bụ ihe a ma ama eme ji wụnyere pati ha aja na garị na ntuliaka na-abịa.

Ọ sịrị, “Ekwenyere m na o nwere ndị nọ na Villa chọrọ ka e merie anyị na ntuliaka mana ọ gaghị agara ha.”

” Ha nwere onye ha chọrọ ka ọ bụrụ ya meriri na ntuliaka imeụlọ(APC) mana ọ garịghị ha ka ha siri chọọ.”

“Ha na-agbalị ịhụ na anyị emerighị na ntuliaka, zoo n’azụ ebumnobi onyeisiala ime ihe o chere bụ ihe kwesịrị.”

Ebubo El-Rufai na-abịa dịka ọ gachara otu izu, onye na-azọ ọkwa Onyeisiala n’aha APC bụ Bola Tinubu kwuru oge ọ gara achụmta vootu n’Abeokuta,isiobodo Ogun steeti na ụkọ mmanụ ụgbọala na ibipụta ego ọhụrụ bụ iji hụ na ya emerịghị na ntuliaka.

Tinubu na ndị nwere agba na APC dịka Ahmed Lawan bụ onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu, Osote Onyeisiala bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo, Mịnịsta na -ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige nakwa Mịnịsta njem bụ Rotimi Amaechi, Gọvanọ Ebonyi bụDave Umahi, nke Kogi bụ Yahaya Bello, nke Krọs Rivas bụ Ben Ayade, aka chiribu Imo steeti bụ Rochas Okorocha, Mịnịsta Teknụzụ bụ Ogbonnaya Onu , nke Agụmakwụkwọ bụ Emeka Nwajiuba na ndị ọzọ zọrọ ọkwa onye ga-efe APC ọkọlọtọ na ntuliaka imeụlọ ha mere mana Tinubu meriri.

N’okwu mbipụta ego ọhụrụ, El-Rufai kwuru na ụta adịghịrị onyeisi Ụlọakụ Etiti bụ Godwin Emefiele dịka Onyeisial Buhari mebuorola ụdị ihe a mbụ iji hụ na ọ kụrụ ndị zupuru ego ahịa.

“Ndị mmadụ na-ata onyeisi CBN ụta maka ibipụta ego ọhụrụ mana ndị mmadụ kwesịrị ị laghachi azụ hụ na Buhari meburu ya n’oge ọchịchị ya na Idiagbon bụ oge ọ gbanwere ego iji jide ndị zofuru ego ha nwetara n’ụzọ akwụghị ọtọ.”

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.