Ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Inec n’ịchafụ, ekwuola na ụkọ mmanụ ụgbọala nke dị ugbua na Naịjirịa nwereike imetụta ntuliaka a na-akwado n’ọnwa Febrụwarị na Maachị afọ a.
Mahmood Yakubu bụ onyeisioche Inec kwuru nke a n’ụbọchị Tuzde n’Abuja n’ọgbakọ nke ya na otu jikọrọ ndị ọrụ ụgbọala nwere n’isi ụlọọrụ Inec.
Otu abụọ sonyere n’ọgbakọ a bụ ndị ‘Nigerian Association of Road Transport Owners’ (NARTO), ndị ‘National Union of Road Transport Workers’ (NURTW), na ụfọdụ ndị ọzọ.
“Inec kwenyere n’ụjọ ụnụ na-atụ maka ụkọ mmanụ ụgbọala nakwa etu o nwere ike iji metụta njem ndịọrụ anyị n’ụbọchị ntuliaka,” Yakubu kwuru n’ọgbakọ ahụ.
“Nke bụ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ahụghị mmanụ ụgbọala, ọ ga-emetụta atụmatụ anyị nwere maka ụbọchị ahụ.”
“Nke a mere na mụ na ndị isi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company (NNPC) ga-enwe ọgbakọ iji chọọ ihe anyị ga-eme maka ọnọdụ a nakwa etu anyi ga-esi gbochie ọdachi.”
Yakubu rịọrọ ndị isi NURTW na NARTO ka ha rụọ ọrụ ha nke ọma hapụ imenyere otu onye hapụ onye nke ọzọ dịka ha ga na-ebugharị ndịọrụ Inec n’ụbọchị ntuliaka.
Ọ dọrọ aka na ntị na agaghị anabata njem ọbụla si n’otu steeti gaa steeti ọzọ, ma kwukwaa na onweghị onye ọrụ Inec a ga-ebu gafee okpuru ọchịchị ebe ọ ga-arụ ọrụ n’ụbọchị ntuliaka.
Leave a Reply