Take a fresh look at your lifestyle.

Egwuregwu ụmụaka n’egwu mgbe gboo na oge a.

Chigo dere ya.

0 660

Egwuregwu ụmụaka n’egwu mgbe gboo na oge a.

  1. Ịwụ ụdọ:

Ụmụaka na-awụ ụdọ ihe dị egwu. A na-eji ya eme nwale ọ ga-emeri ibe ya ọkachasị ụmụnwaanyị. Otu onye jide n’otu isi, onye ọzọ ejide n’isi nke ọzọ, ndị mmadụ e si n’ihu mana azụ na-abanye.

Ọ naghị adị mfe isi n’azụ banye mana ebe ahụ ka ọ na-aka mma maka ụfọdụ oge, iwu na-abụ na ị ga-esiriri n’azụ febanye, ị melighi ya, ị pụọ.

  1. Ịkpọ ọga:
  2. Ife Kaịt(Kite):
  3. Ịtụ swelụ:

Ọ bụ nke otu ụkwụ, ka ọ bụ nke ụkwụ abụọ na-akacha gị mma ịtụ? Ọ bụ nke a na-aka anọ kaọbụ ise

  1. ‘Oliọma Danger’:
  2. Tinkọm tịnkọm:

“Tịnkọm tịnkọm, tịnkọm tịnkọm, tịkalika alịka, dalin nke m o, dalin nke m ooo” I nwereike imezuo nke a.

  1. Ịnya bọres

Ebe a ka a na-ama ụmụnwoke nwere akọnauche gbasara ịrụ igwe. Bọres bụ ihe ụmụnwoke ji osisi arụ tinye ya ụkpụrụ ọ ji abụ a kwa ya, ọ gbapụ ọsọ.

  1. Kpukpukpu ogene:
  2. Ịgba bọọlụ jiri osisi mee ọnụ goolu:

Ụmụnwoke mere nke a nke ọma maka na ọ bụ ha na-agbakarị bọọlụ mana ụmụnwaanyị mekwara ya. Ịgba bọọlụ na-amasịkwa ụfọdụ ụmụnwaanyị n’ezie.

  1. Ịwọ akwa na ịzụ okwe

 

Ihe ụmụaka jizi egwu egwu taa.

  1. Ihe onyonyo: Ụmụaka na-atọzi n’ihu onyonyo ekiri onyonyo dị icheiche
  2. Egwuregwu onyonyo(video games): Nke a bụkwa nke na-ewu. O nweghi ụdịrị egwuregwu na-adịghịzi n’ụdị a dịka egwuregu bọọlụ na ndị ọzọ
  3. Ihe ndị e ji egwuegwu(Toys): E nwekwaziri ihe ndị n’ụdị dị icheiche na-eme ụmụaka obi aṅụrị.

Eziokwu bụ na etu e siri mee ya n’oge gboo dị mma, etu e si emekwa taa amaka.

Ọ dịkwa mma ma ọ bụrụ na nne na nna ga-akụziri ụmụ ha nke gboo tinyere nke ọgbara ọhụrụ taa n’ihi na nke ndị gboo na-eme ka ụmụaka nwee ezi mmekọrịta n’etiti onwe ha iji mara etu ha si eme omume

na ihe na-adị nwanne ha mma karịa ịkpa icheiche.

BBC

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *