. Alụmdi na nwunye mgbanwe batara na ya.
Ihe gbanwere n’ihe alụmdi na nwunye dị ọtụtụ mana nke kachasị nke bụ na a malitere ịga n’ụlọụka mee agbamakwụkwọ karịa ịkụ aka, idebe ego na ịdọ mmanya a na-emebu na mbụ.
Nke ka nke bụ na ụfọdụ ndị mmadụ malitere ịhụ agbamakwụkwọ e mere n’ụlọụka ka ọ ka mkpa karịa omenaala e kwesiri imere ezinaụlọ.
N’oge mbụ, a na-eme ihe ndị a:
- Iru mgbede:
A ga-edopu nwaanyị a chọrọ ịlụ ka o dochie ahụ tupu ọ laa n’ụlọ di ya mana mmekọ si n’aka ndị ọcha mere na a naghị emezi nke a n’ụwa taa.
- Ije di:
Nwaanyị chọrọ ilu di na-agabu n’ezinaụlọ nwoke chọrọ ịlụ ya ka ya na nne dị ya nọrọ ka a marakwa ma a zụrụ ya azụ.
Ụfọdụ mmadụ ka na-emekwa nke a mana ọtụtụ anaghị emezi ya. N’oge a, nwaanyị ahụ na-alụ di ga-eme ihe niile iji gosi nne di ya na a zụrụ ya azụ.
- Ịga ọrụ ọgọ:
N’ụfọdụ omenaala, nwaanyị gaa ije di, nwoke ga-aga rụọrọ ndị ọgọ ya ọrụ dịka ịkọrọ ha ji maọbụ ihe ọbụla ha chọrọ.
Ọ ga-enyere nna nwunye ya aka rụọ ọrụ a ga-eji ama ma ọ dịkwa ike ọrụ ọ ga-eji zụọ nwa ha nri nke ọma ka ọ bụ onye ume ngwụ.
N’oge a, nwoke ahụ ga-agbalịsị ike ịhụ na o mepụtara ezinaụlọ ya ihu ka ihere ghara ime ya maọbụ a gwa ya na ọ gaghị alụzi nwaanyị ya.
- Ọgọ mara be:
Ọtụtụ ka na-etinye uche na nke a, ọ ga-abụ nwoke na nwaanyị lụchaa onwe ha, ezinaụlọ nwaanyị aga n’ezinaụlọ nke nwoke ka e lee ha ọbịa, ka ha mara ebe nwa ha nwaanyị na-aga.
A ka na-emekwa nke a n’ọtụtụ ebe mana oge a ọtụtụ ndị bizi n’obodo mepere emepe, ndị mmadụ anaghị etinyezi ya uchu mana oge a bụ oge ndị ọgọ ji ama ndị ọgọ ha ọ ga-abụ ha zute na mba, ha amara onwe ha.
BBC
Leave a Reply