Onyeisiala Buhari Enweela Aṅụrị N’Isi Akande Maka Ịgba Afọ Iri Asatọ Na Anọ.
Timothy Choji dere ya na Bekee
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekeleela aka chịrị Osun steeti n’oge gara aga bụ Chief Bisi Akande, onye isi oche mbụ nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress, (APC) , n’ụbọchị ncheta ọmụmụ ya nke iri asatọ na anọ, ma kọwaa ya dị ka ezigbo onye ọchịchị na mmadụ ọha dum.
N’ozi iji cheta ememe ahụ, Onyeisiala toro aja nke ọ chụrụ dịka otu n’ime ndị na-akwado ọchịchị onye-kwuo-uche-ya nke mba ahụ, onye o kwupụtara na o ji obi dị umeala were mmalite ma weghara ọnọdụ kachasị elu nke pati ahụ site na ịrụsi ọrụ ike.
Onye isi ala Buhari kwuru na Chief Akande ga-aga n’ihu na-egosipụta onwe ya dị ka ezigbo onye ọchịchị na ihe na-egosi ndụ ịchụ aja, obi siri ike na iguzosi ike n’ezi ihe.
O kpeere ya ekpere ijere paati na obodo ozi ogologo afọ na-abịa n’ihu.
Ike Umenaba
Leave a Reply