Take a fresh look at your lifestyle.

Akwụkwọ ego naịra ọhụrụ anaghị aṅacha aṅacha – CBN

0 460

Ụlọakụ etiti nke ala Naịjirịa ekwuola na akụkọ na-efegharị n’igwe nzirikota ozi soshal midia nke na-ekwu na naịra ọhụrụ ha wepụtara na-aṅacha aṅacha bụ asị ọcha.

Ha kwuru nke a site n’akwụkwọ ozi nke otu onye isi ha bụ Ahmed Halilu wepụtara, ma kọwaa na ọ bụkwa usoro ha si ebipụtabu naịra nke ochie ka ha sikwa pipụta nke ọhụrụ a.

Halilu kọwara sị: “Anyị chọrọ ịkọwara ụmụ Naịjirịa niile na…naịra nke ọhụrụ a na nke ochie dịbu mbụ, e nwereike ịkpọ ha otu ihe, ọ bụrụ na i were ha tee n’akwa ọcha, ị ga-ahụ ụcha ‘intaglio ink’, mana ọ pụtaghị na ọ na-aṅacha aṅacha.”

“Otu njirimara ‘intaglio ink’ bụ na ọ naghị agbaze agbaze na mmiri, ọ na-etesakwa n’ihe ọbụla na-acha ụcha n’ihi etu e si rụpụta ya.”

“Ihe a bụ njirimara akwụkwọ ego niile iji mee ka ha dị iche n’ego adịgboroja.

“Naịra bụ akwụkwọ ego anyị ma bụrụkwa otu n’ime njirimara Naịjiria. N’ihi nke a, anyị na-akpọku ụmụ Naịjirịa ka ha kwụsị iji ego naịra eme nnyochapụta iji chọpụta ma ọ na-aṅacha ka ọ bụ ọnaghị aṅacha.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *