Take a fresh look at your lifestyle.

Kano steeti ga-ewulite mbupu Hibiscus

0 462

Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na ihe ndị sitere n’okike nke Kano steeti bụ Dọkịnta Yusuf Jibrin Rurum ekwupụtala na gọọmentị steeti etinyela nnukwu mbọ iji hụ na mgbasawanye ọrụ ugbo hibiscus na steeti ahụ. Kọmishọna a mere ka a mara nke a n’oge ọ gara n’ụlọ ọrụ fumigation hibiscus kasị ukwuu n’Africa, nke dị na steeti ahụ ma bụrụ nke Mumin Foods and Drugs Limited nwe ya.                                                                                                          O kwuru na steeti ahụ nwere obi ụtọ ịhụ ka ndị na-etinye ego na-eme nke ọma na mbupụ ifuru hibiscus, na-agbakwụnye na gọọmentị steeti ga-enye aka n’ịhụ na a na-enweta nnukwu mgbasawanye na azụmahịa n’oge na-adịghị anya.                                                                                                                              “Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị ịhụ ka ndị amaala na-achịkọta nnukwu ego dị otú ahụ.                                                                                                                            Anyị ahụla ka ewebata teknụzụ ọhụrụ yana usoro ndị metụtara. O kwuru, “Nke a bụ ihe anyị chọrọ ịhụ ka obodo azụmaahịa anyị na-eme, anyị ga-ahụkwa na mgbasawanye azụmahịa na-adịgide adịgide dịka steeti,” ka o kwuru.                                                                                      A na-atụkwa anya ịkwado nnukwu mbupụ ifuru iji nweta ego mba ofesi maka ndị ọchụnta ego n’otu n’otu na steeti.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *