Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe atọ dị mere akwamozu Benedict XVI ji bụrụ ọpụrụiche n’ụka Katọlịk nke ụwa

0 581

Puku kwuru puku ndị mmadụ apụtala maka ịkwanyere onye bụbu Poopụ bụ Benedict XVI ugwu ikpeazụ na Vatican

Akwamozu onye bụbu poopu bụ Benedict XVI bụ ihe na-emetụbeghị n’ogologo oge n’ụka Katọlịk nke ụwa bụ na nke a ga-abụ oge mbụ otu Poopu ga-akwaozu Poopu ọzọ.

Akwamozu a nke na-aga n’ihu taa bụ Tọọzde n’ụka Saint Peter Basilica nke Rome. Nke a bụ ụka a na-ahụta dịka otu n’ime ndị kacha dị nsọ n’ụka Katọlịk nakwa otu n’ime ebe ndị njem na-aga ala nsọ na-akacha aga.

Poopụ Francis bụ onye na-achị ụka Katọlịk ugbua ga-anọ n’isi emume akwamozu onye bụbu Poopu bụ Benedict XVI, nke nwụrụ na ngwụcha afọ gara aga n’afọ 95.

A mụrụ Joseph Ratzinger na mba Germany dịka a họpụtara ya n’ọnwa Mee 2005 dịka Poopu ga-anọchite John Paul nke abụọ onye n’ọkwa ya nwụọ.

Cheta na n’ọnwa Febụwarị 2013 na Benedict XVI gbara arụkwaghịm n’ọkwa ya ihe na-emebeghị n’ọchịchị ụka Katọlịk kemgbe ihe ruru afọ 600.

E nwebeghị Poopu ọzọ rituru n’ọkwa kemgbe Gregory XII mere nke a n’afọ 1415. Benedict na-eso Celestine V onye mbụ mekwara otu ihe dị etu a n’afọ 1294.

Nrịtu n’ọkwa Ratzinger bụ maka okwu ahụike ya nakwa ịka nka nke mere akamozu ya ji bụrụ ihe pụrụiche.

Ọnụ na-ekwuru Vatican bụ Matteo Bruni kọwara na “Dịka Benedict XVI si chọọ, akwamozu ya ga-adị jụụ ma bụrụ nke obi ume ala.”

N’ime ihe ndị niile, ile ihe atọ mere akwamozu onye bụbu Poopu a jiri bụrụ ihe pụrụ ezigbo iche.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *