Take a fresh look at your lifestyle.

Ntụliaka Afọ 2023: Otu Ndọrọndọrọ Ọchịchị Ekwela Nkwa Inye Ezi Gburugburu Azụmaahịa.

Toochukwu Ifejika dere ya na Bekee

0 416

Onye ji ọkọlọtọ Young Progressive Party (YPP) azọ ọkwa ọchịchị Federal Constituency nke Awka North na South bụ Hon. Kingsley Uyammadu ekwuola na ọ bụrụ na a họpụta ya n’ọkwa ọchịchị dịka onye omebe iwu, isi ihe ọ ga-elekwasị anya ga-abụ ịmepụta gburugburu dị mma iji kwalite azụmahịa na mmepụta ihe.

O kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị otu Nigerian Union of Journalists (NUJ) okwu n’ọgbakọ kwa ọnwa ha nwere n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi Godwin Ezeemo International Press Centre dị n’Awka

Uyammadu kwuru na kamgbe afọ 1999, ọchịchị ime obodo Awka North ewepụtala naanị otu onye ụlọ omebe iwu. O kwuru na ya sonyeere ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ọ gbanwee akụkọ ahụ ma ugbu a bụ oge Chineke.

Isi Ebumnuche.

“Ihe mbụ m ga-eme dị ka onye omebe iwu bụ ime ka gọọmentị dozie ikike ọrụ ugbo n’Awka North.

“Ọ dịghị ihe ga-akwalite akụ na ụba karịa mmepụta ihe, ma nsogbu bụ na anyị enweghị gburugburu na-enyere aka. Anyị enweghị akụrụngwa dịka ọkụ eletrik na ezigbo okporo ụzọ,” o kọwara.

Ndị Ndu Zuru Ezu

“Anyị nwere ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị mana ole na ole bụ ndị ndu. Ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị enweghị ezi ebumnuche. Anyị chọrọ ndị ndu zuru ezu bụ ndị nwere ike ichepụta ezi echiche. Anyị enwebeghị ezigbo nnọchite anya na etiti.

“Dịka ndị nta akụkọ, olile anya obodo dị ụnụ n’aka. Ogo gọọmenti nile bụ nke na-ezughị oke n’ọrụ ma ọbụ ndị mgbasa ozi nwere ike iweta olileanya n’ọnọdụ a. Ụnụ nwere ikike itinye ndị ọrụ ahọpụtara na nlele. Ụlọ ọrụ nta akụkọ bụ akọ na uche obodo ọ bụla. Kwuo ya otu ị na-ahụ ya ma atụla egwu ikwu eziokwu n’ihi na nke ahụ bụ nanị ihe nwere ike ime ka obodo dị mma. Ka anyị jikọọ aka napụta obodo a n’aka ndị ajọ omume,” ọ dụrụ ha ọdụ.

 

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *