Take a fresh look at your lifestyle.

Mmadụ anọ anwụọla na mwakpo ụlọọrụ Inec n’Owerri

0 445

Ndị ekperima amaghị ndị ha bụ wakporo isi ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ ‘Independent National Electoral Commission’ (Inec) dị n’Owerri, Imo Steeti n’isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde a.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Michael Abattam kwuru na ndị uweojii gburu mmadụ atọ n’ime ndị bịara mwakpo a ebe otu onye uweojii nwụkwara.

Otu onye uweojii ọzọ merụkwara ahụ dịka ha na ndị ekperima ahụ na-akwakọrịta mgbọ.

“N’elekere iri na abụọ nke isi ụtụtụ taa, ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Ipob/ESN wakporo ụlọọrụ Inec, tụọ ogbunigwe ‘dynamite’ nakwa ogbunigwe e ji petrol rụọ,” Abattam kwuru.

“Mana ndị uweojii lụsoro ha ọgụ ma chụọ ha ọsọ, dịka ha na-agba ọsọ, ha hapụrụ otu ụgbọala lexus ojii, mana ndị uweojii gburu mmadụ atọ n’ime ha.

“Anyị napụtara ha egbe AK47 atọ, egbe pump action atọ, ogbunigwe abụọ na-agbabeghị agba, ogbunigwe petrol ndị ọzọ, nakwa ọtụtụ ọgwụ a gwọrọ agwọ.

“Anyị ejidekwala mmadụ abụọ n’ime ha ndị mgbọegbe tụrụ.”

Abattam gara n’ihu kọwaa na ndị ekperima ahụ si n’ogige ebe a na-ere mmanụ ụgbọala iji tụbanye ogbunigwe ahụ n’ime ụlọọrụ ndị Inec.

O kwuru na ọ bụ ụlọ abụọ nakwa otu ụgbọala dị n’ogige ụlọọrụ Inec ka ọkụ ahụ metụtara.

Ọ gara n’ihu kwuo na ha bụ ndị uweojii anaghị arahụ ụra gbasara ọnọdụ nchekwa n’Imo steeti iji hụ na ntuliaka 2023 ga-agarịrị n’ihu dịka e si hibe ya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *